Home News Emume Afo Iri Abua N’ise: Nwunye Onyisi Ala Akpoola Oku K’Olu Umunya...

Emume Afo Iri Abua N’ise: Nwunye Onyisi Ala Akpoola Oku K’Olu Umunya Sonye N’oru Obodo

Emume Afo Iri Abua N’ise: Nwunye Onyisi Ala Akpoola Oku K’Olu Umunya Sonye N’oru Obodo

Egwu njiri mara umunwanyi were onodu n’oge emume igba afo iri abua n’ise nke ulo omebe iwu ECOWAS bu otu ụmụ nwanyị ha (ECOFEPA) kpokọbara otu ụmụ nwanyị ndi ozo di iche iche itinye onu n’okwu n’ihe gbasara ụmụ nwanyị n’akụkụ ọchịchị.

N’ogbako ahu, Nwunye Onyeisi Ala Nigeria, Senato Oluremi Tinubu bu Hajia Aisha Barau nọchiri ya, kpọrọ òkù ka a gụọnye olu ụmụ nwanyị n’Ụwa Anyanwụ Afrika.

Nwunye onyisi ala, gwara ndị sonyere na mgbochi an’egbochi ụmụ nwanyị ịbanye na ọchịchị ga-emerịrị ka e wepụ ha ma ọ bụrụ na mpaghara ahụ chọrọ imegharị.

O kọwara na nnọchi anya ụmụ nwanyị dị ntakịrị na-enye ohere ka ụgha, ozi efu na misinformation gbasaa ngwa ngwa, nke na-emerụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma na-ebute ntukwasi obi dara ada.

Onye okwuru ndi omebe iwu ECOWAS, Hon. Hadja Memounatou Ibrahima bu Hon. Adjaratou Coulibaly nọchiri anya ya, na onyisi ochichi ECOFEPA, Hon. Veronica Sesay, kpọrọ òkù ka mba niile n’ógbè ahụ chekwaa ụlọ ọrụ ọchịchị, gbochie akuko ugha, ma mee ka ụmụ nwanyị banye n’ihe ndọrọ ndọrọ ọchịchị karịa.

N’agbanyeghị n’ulo omebe iwu ECOWAS ji ọṅụ kwuo na e nwere pecenti iri abua n’isii n’uma ato, ndị inyom n’ọchịchị nke kasị elu ha nweta, ọdịiche ka dị ukwuu: Senegal nwere ihe karịrị pecenti iri ano n’abua, ebe Nigeria nọ naanị pecenti isii.

Ozi dị n’emume a doro anya:

Agaghị ewere eziokwu chebe, ma ọ bụ mee ka ọchịchị too n’Ụwa Ndida Anyanwụ Afrika, ma ọ bụrụ na a naghị etinye ụmụ nwanyị n’etiti ọnọdụ ndu.

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here